Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 06, 2026

Aha onyonyo,Akụkọ dị mkpa - October 7 2026
Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 06, 2026

Mgbe e biputara ya

14 Julaị 2025

Mgbe ikpeazụ e tinyere ya ozi ọhụrụ nkeji 55 gara aga

Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:

  • Ọ banyela ụbọchị atọ a na-achọ ozu ndịagha Nigeria bụ ndị nọ n'ụgbọelu kpọkachara n'Ondo steeti ma gbuo mmadụ iri atọ.
  • Dịka ndịagha na-achọ igwuputa ibekere ụgbọelu ahụ maọbụ ozu ndị nwụrụ, ha machiri ndị mmadụ ịga na gburugburu ebe ụgbọelu ahụ dara ma kwuo na ha ga-eme nnyocha ma chọpụta etu mkpamkpa ahụ si kpaa.
  • Onye na-eme njem awụọla n'ụgbọelu si mba Kenya na-abata Lagos, Nigeria dịka ndị uweojii bidoro nnyocha banyere ọnwụ onye ahụ.
  • A chọpụtara na onye ahụ adịghịzị ndụ na nkeji ole ma ole tupu ụgbọelu ha efedata n'ọdọ ụgbọelu Murtala Muhammed International Airport dị na Lagos steeti.

Soyere anyị nawebsaịtị,Instagram,FacebooknaWhatsApp chanelụmaka akụkọ niile na-eme n'ụwa.

Skip content and continue reading

End of content

Nkọwa foto,Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp
Nkọwa foto,Whatsapp Chanelu BBC IGBO